NKÀMMÀ: NZIPỤTA ỌNỌDỤ EGWÚ N’ETITI MMỌ NWỤ IJELE
Abstract
Edemede nchọcha a lebara anya n’ọnọdụ egwu dị ka otu n’ime ụzọ pụrụ iche e si ezipụta nkàmmà dị n’etiti mmọnwụ Ijele. Ebumnuche edemede a bụ ka e si na ya wee chetara ụmụafọ Igbo ọrụ egwu na-arụrụ n’ebe ndị mmadụ nọ. Mmọnwụ Ijele nwere egwu dị iche iche e si na ha ezipụta nkàmmà, ma were ha na-egosi na ọnọdụ ya dị elu n’etiti ndị Igbo. N’agbanyeghị ihe ndị a e zipụtara n’elu ebe a, egwu ndị a enwetabeghị ọnọdụ kwesiri ya n’edemede nchọcha. Ọ bụ echiche dị otu a ka mkpalite mmụọ edemede a si pụta, ka e wee si na ya zipụta mkpa egwu dị n’etiti mmọnwụ Ijele. Ọ bụ n’agụmagụ ọdịnala ka e mere nchọcha a, bụ nke na-ezipụta isiokwu gbasara nkàmmà na ọnọdụ egwu nọ n’etiti ndị Igbo site n’ihe a hụrụ n’anya, n’ajụjụ ọnụ, n’ọba akwụkwọ na n’ịntanetị. Atụmatụ e ji wee tụchaa edemede nchọcha a bụ atụmatụ keimeechiche, nke na-ele ọrụ nka anya site n’ụzọ o si agba ama ime echiche onye okà nka ahụ. A tụchara ụsa dị iche iche e si n’ụzọ ndị a nweta, nke e si na ha chọpụta na egwu nwere ọnọdụ pụrụ iche n’etiti mmọnwụ Ijele, ma bụrụ omenala e si na ya ezipụta ọnọdụ ndị mmadụ, ọdịnala ha, nkwenye ha na nsirihụndụ ha. Egwu mmọnwụ Ijele nwere nkàmmà atọ, gụnyere nkàmmà kentị, keanya, na keọnụ. Edemede nchọcha a ga-abara Ọhanaeze na onye ọ bụla nwere mmasị na nkàmmà, egwu na mmọnwụ Ijele uru.