MMEPE OBODO NA NDỊ ỤMỤ NWAANYỊ
Abstract
Ụmụ nwaanyị bụ ndị Chukwu kere iji mezuo nwoke dị ka a hụrụ n’akwụkwọ okike dị na Baịbụl Nsọ. Chukwu kere nwoke mbụ bụ Adam, kekwaa ya ụmị anụmanụ tinye n’Ogige Iden, mana o meghị ka Adam zuo oke. Ya mere, mgbe Chukwu hụrụ na ọ dịghị mma nwoke ịnọ nanị onwe ya, o wee mee ka Adam baa n’oke ụra. N’oge ahụ, o wepụtara otu mkpịsị ụgịrị ya wee kee nwaanyị mbụ aha ya bụ Ivu. Kemgbe ahụ ka nwaanyị si bịa dị nkenke eme ire na ndụ nwoke n’ụwa dum. N’oge gboo, anaghi agụnye nwaanyị n’ọnụ ọgụ n’ihi na ọ bụ nkwenye ndị gboo na oke na ọrụ nwaanyị bụ nanị iledo ụmụaka anya, werezie isi okwu mechie ọnụ. Ha na-anọkarị n’ụlọ belụsọ ma ha eje ugbo ma ọ bụ ichu mmiri. Ọtụtụ ekwenyeghi n’izụ nwa nwaanyị n’ụlọ akwụkwọ ziri ezi n’ihi na ha hụrụ ya ka imefusi ego, o tolite ọ lụọ di okwu agwụ. Onye mụtara nanị nwaanyị asị na ama ya echiela nke a ga-eme ka a gbaa mbọ ịmụ nwa nwoke, nke a nwere ike mee nwoke ọ lụọ. Ọtụtụ ụmụ nwaanyị ebe ha na-achọ nwa nwoke. E nwekwara ụfọdụ ụmụ nwoke n’oge ugbu a ka na-ahụta ụmụ nwaanyị ka ndị e nweghị uru ha bara belụsọ isi nri na ịmụ ụmụ. Ha na-ezipụta ya site n’ụdị okwu ha ji atụnyere ụmụ nwaanyị dị ka isi: “nwaanyị na-etukwu ala anya amịrịa.” Ọtụtụ omenala anaghi ekwe ụmụ nwaanyị emegharị ahụ n’obodo. Ihe ndị a niile wee bụrụ ogbatuhie dịịrị ụmụ nwaanyị na agamniihu ha. Mana mmepe obodo mere ka ụfọdụ ihe malite gbanwebe na ndụ ụmụ nwaanyị n’ụzọ dị mma na n’ụzọ adịchaghị mma. Edemede a ga-agba n’ọnwụ ndụ ụmụ nwaanyị gboo na ugbu a wee zipụta mgbanwe batara na ya. Odee gbasoro usoro nkọwa wee zipụta mgbanwe ndị a batara na ndụ ụmụ nwaanyị. Edemede a ga-eme ka ndị mmadụ mata ihe kwesiri ụmụ nwaanyị, mata na ha so bụrụ mmadụ ma hụtakwa ihe ha ga-eji kelee Chukwu n’isi ụmụ nwaanyị. Ọ ga-eme ka ụmụ nwaanyị mara ebe ha si ada pụọ ma laghachi azụ n’ịbụ ezi nwaanyị. Ọ ga-enyekwara onye nchọcha ọzọ aka ịtụ ebe mgbakasị ụkwụ na nchọcha ya. Ọ ga-adị mma ma ndị odee akwụkwọ agụmagụ Igbo kàba ahụ ịtụle na ha na-ewebata mgbanwe ndị a n’akwụkwọ ha, kwalite uru nwaanyị bara ma kpochapụ ụfọdụ ajọ agwa ụmụ nwaanyị na-akpata n’oge ugbu a iji kwalite ugwu ndị Igbo na mpaghara ụwa dum.