NDỊ NTOROBỊA NA “IBUTE IKE” N’OGE UGBU A N’EJIJE ERIRI MARA NGWUGWU NA IJE EGO
Keywords:
Ibute Ike, Oke IteAbstract
Ọchịchọ isonye n’ihe a na-eme na inwe ọnụ okwu n’obodo, edubala ọtụtụ ndị mmadụ tụmadị ndị ntorobịa n’oke ọchịchọ n’ihi na ndị Igbo kwenyere na ọ bụ onye kpụ igu ka ewu na-eso. Ọtụtụ mmadụ n’oge ugbu a chọrọ ịma ma aha gị ọ na-ada ụda tupu ha emeere gị ihe ọbụla. Nke a mere na ọtụtụ ndị ntorobịa achọghị ịma akwụ chara acha na nke achaghị; ihe ha ma bụ si gbute ya etu ọbụla. Ọzọ, ndị kpatara akụ na-enwe enyi ndị a na-anụ aha ha anụ na ndị ji ike n’ọkwa gọọmentị n’otu ụzọ maọbụ ụzọ ọzọ. Nke a pụtara ihe n’okwu ndị ntorobịa na-asị “sowe ndị ma ụzọ”. Ihe niile a mere ụfọdụ ndị ntorobịa ji gbaa isi akwara ịhụ na ha kpatara ego n’ụzọ abụla ụzọ iji nwee akụnaụba na ike n’oge ugbu a. Ọnọdụ dị etu a ebutela oke iwepụ ndụ na ime ihe ntị na-asọ oyi. Ọ bụ ihe ndị a kpaliri mmụọ odee ileba anya n’ejije Igbo wee zipụta etu odee ejije ndị a si zipụta ya n’ihi na agụmagụ bụ enyo e ji ahụta ndụ. Nchọcha a gbasoro Usoro nkọwa ma gbado ụkwụ n’atụtụ saikoanalisis nke Sigmund Freud tụpụtara n’afọ 1856-1939 wee tụchaa ejije ndị a họọrọ iji mee ka isiokwu a doo anya. A chọpụtara na ọtụtụ ndị mmadụ na-eme mpụ na arụ dị iche iche iji nwee ego ma sonye n’ihe a na-eme n’oge ugbu a. A hụkwazịrị na okwu nne na nna ụfọdụ na-agwa ụmụ ha so eduba ha ime ihe ọbụla iji dị ka ndị ntorobịa ibe ha. Nchọcha a mere ka a mara na e nwere ihe dị iche n’ịkpata ego na ibute ike maka na ịkpata ego bụ ịrụ ọrụ ziri ezi maọbụ site n’akaọrụ mmadụ nwere wee nwee ego mana ibute ike bụ mmadụ isi n’ụzọ abụla ụzọ wee baa ọgaranya. Nchọcha a ga-eme ka o doo ndị ntorobịa anya na akụ enweghị be ya mere ka onye ọbụla were ụwa nwayọọ. Ọ ga-emekwa ka ndị nne na nna tinye anya n’ihe ụmụ ha na-arụ. Ebe agụmagụ bụ enyo e ji ahụta ndụ, ọ dị mkpa ka ndị odee agụmagụ Igbo nyekwara aka ịkatọ ndụ oke ọchịchọ site n’izipụta ọghọm ya n’akwụkwọ ha ma mee ka ndị mmadụ mata na ezi aha ka ego n’ihi na akụ enweghị be.