AGỤMAGỤ EDEREDE DỊKA ENYO: NNYOCHA OMIMI BANYERE NDỤ NDỊ ỌCHỊCHỊ N’ALA IGBO
Keywords:
Agụmagụ, ndụ ndị ọchịchị, ọchịchị, usoro nhọpụtaAbstract
Agụmagụ ederede na-arụ ọrụ dị mkpa dịka enyo e ji ahụ ma na-enyocha ndụ na omume ndị ọchịchị n’ala Igbo. Isiokwu a na-elekwasị anya n’ịtụle etu agụmagụ ederede si bụrụ enyo e ji enyocha, ekpughe ụdị ndụ, omume na usoro ọchịchị ndị ndu na-egosipụta n’etiti ọha mmadụ. Ebumnuche nchọcha a bụ igosi etu ndị odee si eji agụmagụ ederede ekpughe eziokwu gbasara omume ndị ọchịchị ma na-egosipụta mmekọrịta dị n’etiti ndị ndu na ndị ha na achị. Nchọcha a jiri usoro nkọwa wee nyochaa akwụkwọ agụmagụ ederede ndị a họọrọ nke gụnyere O Ji Ihe Nwata, Ọchịchị Ekperima na Omume Onye na-edu Ya. A gbasoro atụtụ nṅomi nke Aristotle tụpụtara wee mee nchọcha a. A chọpụtara na agụmagụ ederede na-arụ ọrụ dịka enyo nke na-ekpughe omume ndị ọchịchi, ̣ọ kachasị omume ọjọọ dịka nrụrụaka, iri ngarị, mmegbu, ịla akụ n’iyi, ikwe nkwa efu na iji aghụghọ gbanwee usoro ntụli aka. Ọzọkwa, nchọcha a chọpụtara na ndị odee na-eji akụkọ na agwa akụziri ndị mmadụ ihe gbasara ezi ọchịchị ma na-akpalitekwa echiche ha. N’ihi ya, a kwadoro na agụmagụ ederede bụ enyo e ji akọwa ma na-akọrọ ndị mmadụ eziokwu gbasara ndụ ndị ọchịchị n’ala Igbo ma na-akpọkwa ndị ndu ka ha rụọ ọrụ ha nke ọma.