Ntụlekọrita obinime n’asụsụ Igbo na Chainiiz
Keywords:
Ntụlekọrita, obinime, asụsụ Igbo, ChainiizAbstract
Obinime bụ nkebiokwu keaha nke na-enweta nrugharị ya site na nkebiokwu keaha ọzọ dị na nkebiahịrịokwu ahụ. Nchọcha a dabeere n’atụmatụ ntụlekọrịta nke Lado (1957) na atụmatụ nkekọ nke Chomsky (1981), wee tụlekọrịta mmekọta obinime na obinonwe n’asụsụ Igbo na Chainiiz iji gosi ebe ha yiri na ebe ha dị iche. Nchọpụta sitere na nchọcha a na-egosi na Igbo nwere naanị otu ngosipụta obinime, ya bụ mmeronwe, ebe Chainiiz nwere ụdị abụọ, mmeronwe na mmerịta. A bịara n’iwu nkekọ, asụsụ abụọ a na-enupụrụ iwu nkekọ isi ebe ụfọdụ. Mmeronwe ụfọdụ n’asụsụ Chainiiz, dị ka zìjǐ, na-anabata nkekọ ọteaka, nke megidere iwu nkekọ. Nchọcha a dị nnukwu mkpa n’ihi na o gosiri ebe yiri na ndịiche dị n’etiti asụsụ Igbo na Chainiiz iji nyere ndị Igbo na-amụ ya na ndị nkuzi ha aka ịmata ebe a ga-enwe nghọta na nhazi echiche.