“NTULEKỌRỊKA ỌDỊDỊỤDA ASỤSỤ IGBO NA YORUBA”

Authors

  • Orji, Ethel Odinakachi Author

Abstract

Isiokwu nchọcha a bụ. Ọdịdịụda asụsụ bụ alaka sayensị amụmamụ na-akọwa etu asụsụ Igbo izugbe maọbụ olundị si ahazi ụda dị n’asụsụ ahụ nke ọma iji nwee ezi mpụtara. Nsogbu nchọcha a bụ na ọ bụ ihe dị mkpa na onye ọbụla kwesịrị ịmụta asụsụ ọzọ nke abụghị asụsụ a munyere onye ahụ na ya tinyere nke ọ maara n’ihina nke a na-eweta ezi mmekọrịta mmadụ na ibe ya n’ebe ịzụ ahịa, mkparịtaụka, ofufe nke okpukperechi nakwazị ihe ndị ọzọ, dị. Ọ bụ n’ihi nke a ka nwa nchọcha jiri nwee mkpali n’ebe isiokwu a bụ ntulekọrịta ọdịdịụda asụsụ Igbo izugbe na Yoruba dị iji nwee ebe e deturu ya edetu n’Igbo ka o wee nyere nwa afọ Igbo ọbụla na-achọ ịmụ asụsụ Yoruba maọbụkwanụ nwa afọ Yoruba na-achọ ịmụ asụsụ Igbo aka. Ebumnobi nchọcha bụ ịkọwada ihe bụ ọdịdịụda asusụ n’Igbo, ịchọpụta ebe abịdịị Igbo na nke Yoruba si dị iche, ịkọwapụta ndịiche dị na mgbochiume ha abụọ nakwazị ụdaume ha abụọ, inyochapụta nsogbu ndị Igbo na-amụ asụsụ Yoruba nwere ike inwe nakwazị nsogbu ndị Yoruba na-amụ Igbo nwere ike inweta. Nka e ji mee nchọcha a bụ nchọcha edereede. Atụtụ e jiri mee nchọcha a bụ atụtụ ntulekọrịka ọdịdịụda asụsụ Igbo izugbe na Yoruba ntụlekọrịta asụsụ nke Lado (1957). Atụtụ ntụlekọrịta asụsụ na-akọwa ma na-enyocha myiri na ndịiche dị n’asụsụ abụọ a na-atụlekọrịta ọnụ. Mgbe e mechara nchọcha a, nwa nchọcha chọpụtara na asụsụ Igbo nwere mkpụrụ ụda iri atọ na isii ebe asụsụ Yoruba nwere mkpụrụ ụda iri atọ. Ụdaume Igbo dị asatọ ebe Ụdaume Yoruba dị iri na abụọ. Mgbochiume Igbo dị iri abụọ na asatọ, e nwere mgbochiume nge na nke mkpị mana asụsụ Yoruba nwere mgbochiume iri na asatọ, e kere nke asụsụ Yoruba ụzọ abụọ; nke e ji ọnụ akpọpụta na nke e ji imi akpọpụta. Site na ntulekọrịta e mere, a chọpụtara na e nwere ụda e nwere n’ asụsụ Igbo na-adịghị n’ asụsụ Yoruba. Nchọcha a ga-abara onye ọbụla nwere mmasị n’ebe asụsụ Igbo maọbụ Yoruba dị nnukwu uru. A na-atụ aro na ndị nchọcha ga-aga n’ihụ mee nchọcha n’ ọdịdịụda asụsụ tụmadụ n’ebe o metụtara asụsụ ndị ọzọ iji chọpụta myiri na ndịiche dị na ha.

Downloads

Published

2025-07-03