Asụsụ Igbo Dị Ka Ngwa Ahịa

Authors

  • Aloysius Umeodinka & Chinwude Ugochukwu Author

Abstract

Mmadụ na-esite n’onyinye Chineke nyere ya, ma ọ bụrụ na ọ chụkwasịghị ya, ọ ga-efu uru onyinye ahụ. Asụsụ Igbo bụ otu n’ime onyinye pụrụ iche Chineke nyere ndị Igbo, dịka o si nye mba France French, England English, Germany German, Portugal Portuguese, na mba ndị ọzọ n’ụwa. Ndị Igbo anaghị eji asụsụ ha eme ngwa ahịa nke ọma, ebe mba ndị ọzọ ji asụsụ ha mee ngwa ahịa n’ụwa, na-enweta ego dị ukwuu. Nchọpụta a chọrọ igosi na asụsụ Igbo zuru oke iji bụrụ ngwa ahịa. Ọ chọkwara igosi etu a ga-esi kwalite asụsụ Igbo ka ọ bụrụ ngwa ahịa iji nweta nnukwu ego, ma gosikwa ihe ndị na-egbochi ndị mmadụ iji asụsụ Igbo dị ka ngwa ahịa. Iji mee nke a, usoro nchọpụta a ga-agbaso usoro nke nkọwa doro anya. A ga-eji usoro Ngwakọta Usoro Azụmahịa nke McCarthy (1960) mee nchọpụta. Nchọpụta a na-egosi na ndị Igbo kwesịrị ịkpata asụsụ ha mkpa, tinye uche na ịdịmma ya. Ha kweskwara ịhazigharị asụsụ ha nke ọma, mee ka ha nwee ezigbo mmekọrịta na Gọọmenti Steeti na nke Etiti, iji welite ojiji asụsụ Igbo n’ebe ọ ga-eji mee ka ọ bụrụ ngwa ahịa bara uru.

Downloads

Published

2016-09-23