MBỤRỤ METỤTARA NZUZU NA NSIRIHỤ ỤWA NDỊ IGBO NA NDỊ BEKEE: N’USORO ASỤSỤ NCHEKE

Authors

  • Florence Uju Ibeh; Patrick I. Umezi (PhD) Author

Abstract

Isiokwu nchọcha a bụ Mbụrụ Metụtara Nzuzu na Nsirihụ ụwa Ndị Igbo na Ndị Bekee : n’ Usoro Asụsụ Ncheke. Ebumnuche nwa nchọcha bụ ịchọpụta ma e nwere ndịiche dị n’etiti echiche mbụrụ ndị metụtara nzuzu na nsirihụ ụwa ndị Igbo na nke ndị Bekee. Usoro e jiri mee nchọcha a bụ usoro nkọwa nke Sọvee. Atụtụ e jiri mee nchọcha bụ Atụtụ Ncheke na Atụtụ Njirimee. Ka e mechara nchọcha a, a chọpụtara na e nwere ọtụtụ ndịiche n’echiche mbụrụ metụtara nzuzu na nsirihụ ụwa ndị Igbo na nke ndị Bekee. Ụfọdụ n’ime ihe ndị a chọpụtara bụ: a bịa na nsirihụ ụwa ndị Igbo, ehi bụ anụmanụ na-eri oke oriri ebe ezi na anyịnya ibu bụ anụmanụ zipụtara nke ndị Bekee. Na nzuzu gbasara nlelị na nganga, ọ bụ enyi na torotoro na nsirihụ ụwa ndị Igbo, ebe ọ bụ enyi nnụnụ na nsirihụ ụwa ndị Bekee. Na nzuzu gbasara fọmfọju akpa, agwọ bụ anụ nwere anya ukwu na irikọta nke ya na ibe ya na nsirihụ ndị Igbo ebe ọ bụ ezi na nsirihụ ndị Bekee. Nchọcha a ga-abara ndị nkuzi, ụmụ akwukwọ na ndị nwere mmasị n’ihe gbasara isiokwu a uru. Na mmechi, aro nwa nchọcha na-atụ bụ: ka ndị okwu dị n’aka gbaa ndị chọrọ ịmụ asụsụ na omenala Igbo n’ụlọ akwụkwọ dị elu ume site n’inye ha ego nkwado ha ga-eji na-agagharị maka ime nchọcha gbasara asụsụ dị iche iche. Ha kwesịkwara ịkwado ndị chọrọ ide akwụkwọ n’akụkọ ala ọbụla ume. Nke a gaeme ka e nwee ọtụtụ akwụkwọ ederede maka nke a. E mee etu a, ogo asụsụ Igbo gaarịgo elu karịa ka ọ dị ugbu a.

Downloads

Published

2019-09-24