MKPỤRỤ OKWU IGBO MAKA NKANỤZỤ

Authors

  • Ilechukwu Chiamaka Patience & Onwudiwe George Elochukwu (PhD) Author

Abstract

Ọtụtụ mgbe ka ọ na-abụ a kpọpụta okwu nka na ụzụ kwesiri ka mmadụ mara ihe ọ bụ, ọ gbagwojuo ya anya n’ihi asụsụ e ji kpọpụta ya bụ nka na ụzụ. Asụsụ Igbo dị nnukwu mkpa maka agamnihu na mmụba okwu nka na ụzụ. Ihe jupụtara ụwa taa bụ aka ọrụ nka na ụzụ, ma akọrọngwa e ji akụzi nkụzi, esi nri, eti egwu, achọ mma na ihe ndị ọzọ na-enyere obibi ndụ aka. Mmadụ ọ bụla nwere ihe jikọrọ ya na nka na ụzụ. A chọpụtara na asụsụ Igbo enweghi aha zuru oke maka nkepụta niile a sayensị na nka na ụzụ nyere anyị, nke a mere na e kwuo ụfọdụ ihe, nghọta ha na-enye nsogbu, ọ kachasị onye amatachabeghi gbasara nka na ụzụ nke ọma. Ebumnuche nchọcha a bụ ịmata etu asụsụ Igbo ga-esi kwalite nka na ụzụ. O hibere isi na mmebe okwu Igbo dị ka o si metụta nka na ụzụ n’ebe ndị a; akpụmakpụ, mgbasa ozi, njem, ịrụ ụlọ, ụlọ akwụkwọ, ụlọ ọrụ na ahịa. E ji atụtụ kenkwalite otu na omenala nke Vygotsky (1978) wee mee nchọcha a. Nwa nchọcha gbasoro usoro sọvee nke gụnyere igba ajụjụ ọnụ wee mee nchọcha a ma chọpụta na nka na ụzụ ndị nwere aha Igbo na-aka enye nghọta doro anya karịa ndị enweghi aha Igbo. Nchọcha a ga-abara ụmụ akwụkwọ na ndị nkụzi uru nke ukwu ma bakwaara nwa afọ Igbo ọ bụla chọrọ agamnihu asụsụ Igbo uru.

Downloads

Published

2022-09-28