NTỌSASỊ NDEHIE ỤTỌASỤSỤ EDEREDE MGBASAOZI IGBO NDỊ A HỌRỌ
Abstract
Nchọcha a lebara anya n’isiokwu bụ ntọsasị ndehie dị n’ederede mgbasaozi Igbo ise. Ndehie bụ ị dachapụ n’usoro iwu odide asụsụ. Ọtụtụ ọge ka ụfọdụ ndị odee mgbasaozi Igbo na-ede n’agbasoghị iwu na-achị asụsụ Igbo. Ụfọdụ ndị na-ede ederede mgbasaozi Igbo n’ụlọọrụ dị iche iche anaghị agbaso iwu ụtọasụsụ Igbo. Ha na-ede dị ka o si masị ha. Ha anaghị akpachapụ anya oge ha na-ede asụsụ Igbo. Ndị isi ụlọọrụ ndị a anaghị achọ ndị gụrụ asụsụ Igbo mgbe ha chọrọ ide mgbasaozi ụlọọrụ ha n’Igbo. Ọ dị ka aga-asị na ha na-eche na onye ọbụla ma asụ Igbo ma ede ya. Ndehie naadị n’ime ederede mgbasaozi ụfọdụ na-ebutere ndị na-agụ ya nghọtahie nakwa enweghị nghota ihe e dere ma ncha. Ebe e siri nweta ngwa nchọcha bụ n’ihe odide mgbasaozi Igbo ise. A tụchasị rị ederede mgbasaozi ndị a nke ọma ma chọpụtacha iwu ụtọasụsụ Igbo dị icheiche nke odee agbasoghị . Onye nchọcha ji ọgụgụ isi ya dị ka onye gụrụ maka asụsụ Igbo wee tụchaa akwụkwọ mgbasozi a. A chọpụtara na ụdị ndehie na-apụtakarị cha ihie n’akwụkwọ mgbasaozi bụ e deteghị nnyemakangwaa, agbasoghị iwu na-achị odide mbuụzọ, etinyeghị ntụpọ ebe o kwesị rị , asụpeghị mkpụrụedemede ndị gbara mkpị nke ọma, e deteghị nnọchiaha na nrụaka nke ọma na ngwakọta asụsụ Bekee na asụsụ Igbo. A na-atụ aro ka onye ọbụla chọrọ ibipụta ederede mgbasaozi asụsụ Igbo hie asaa n’anya ma nye ya ndị gụrụ maka asụsụ Igbo ka ha dee.