UBESIE DỊ KA ONYE NA-ETO DIKE: NNYOCHA JỤỌ OBINNA NA MMIRI ỌKỤ E JI EGBU MBE

Authors

  • Esther Ogochukwu Akpulu Author

Abstract

Onye ọbụla na-eche echiche etu mmụọ ya siri kpalite ya. Nke a mere na ndị odee dị iche iche na-eche echiche ma na-edekwa ihe ọbụla ha na-ede etu mmụọ ha siri kpalite ha. Ọ bụ nke a ka agụmagụ kpọrọ akanka onye. Ụfọdụ ndị odee na-esite n’edereede ha egosipụta otito nye onye ha na-ede maka ya, ọ kachasị igosipụta onye ahụ dị ka dike. Ubesie bụ otu n’ime ndị odee a maara nke ọma n’ito dike. Ọtụtụ ndị nchọcha edeela ihe n’isiokwu dị iche iche gbasara Ubesie na akwụkwọ ya dị iche iche, ma ọ dịbeghị odee na-ahụta ya dị ka onye na-eto dike ma e wezụga G. O. Onyekaọnwụ ebe ọ na-akọwa etu Ubesie si ezipụta ihe na-eme na ndụ agwa ya. Ọ bụ ya mere n’ederede a, e mere nchọcha iji mata ma zipụta etu odee Ubesie si eji ihe ọ na-ede maka isi agwa ya egosi ito dike n’akwụkwọ ya, ọ kachasị na Jụọ Obinna na Mmiri Ọkụ E Ji Egbu Mbe. Iji mee nke a, a gara n’ọba akwụkwọ dị iche iche gụọ ma chọpụta ihe ndị ọzọ derela maka Ubesie na akanka ya nakwa ụzọ dị iche iche ndị odee ọzọ siri zipụta agwa ha dị ka dike. Nchọcha a bụ kenkọwa. E ji agụmagụ Jụọ Obinna na Mmiri Ọkụ E Ji Egbu Mbe were chọpụta na odee nwere ike iji ihe ọ na-ede maka isi agwa ya gosipụta ya dị ka dike. Nchọcha a jikwa atụtụ Ọdịdị were nyochaa akwụkwọ agụmagụ ndị a họọrọ. Edereede a ga-enyere ndị odee n’ọdịnihu aka ịmata ụzọ dị iche iche ha nwere ike isi dee ma hazie nke ha. Ọ dị mkpa ka ndị odee na ndị nchọcha n’ọdịnihu na-eleba anya nke ọma n’ụdị akanka onye dị iche iche e jirila dee agụmagụ iji nyere ha aka, ọ bụghị naanị ịmata ụdị mmadụ ndị odee ahụ bụ kama etu ha ga-esi tinye ụdị akanka ahụ n’ọrụ.

Downloads

Published

2022-09-28