NSOGBU OLUNDỊ N’ỌMỤMỤ IGBO IZUGBE: OLUNDỊ EZEAGỤ DỊKA EBE MGBAKWASA ỤKWỤ
Abstract
Edemede a lebara anya na nsogbu olundị na-ebute na nkuzi na ọmụmụ Igbo Izugbe n’ụlọ akwụkwọ dị iche iche ọkachasị n’olundị Ezeagụ ebe e nwere ọtụtụ ndịiche dị n’etiti ya na nke Izugbe. Oke nsogbu kachasị pụta ihe n’asụsụ Igbo bụ na e nwere ọtụtụ olundị dị iche iche dị na ya, nke ndị bi n’ime ya na-asụ. Mbunuche nchọcha a bụ ịchọpụta etu a ga-esi kwọọ onye ukwu wara ka a hụ na olundị ndị a dị iche iche akpagbughị asụsụ Igbo Izugbe na nkuzi na ọmụmụ asụsụ Igbo n’ụlọ akwụkwọ. A gbasoro usoro sovee wee mee nchọcha a. Ngwa nchọcha bụ a jụọ a zaa nke e depụtara n’akwụkwọ ya na usoro a ga-eji zaa ajụjụ dị iri na abụọ ndị na-enweghi nkewasị. Ụmu akwụkwọ dị narị anọ, bụ ụmụ akwụkwọ si n’ime ụlọ akwụkwọ anọ dị n’Ezeagụ ka e ji mee nchọcha a. Ha bụ ndị JS3, ndị SS1, ndị SS2 na ndị SS3. A chọpụtara na olu Ezeagụ metutara asụsụ Igbo Izugbe aka ebe ọ dị ukwuu nke mere na Igbo Izugbe na-anyụ ka ọkụ ebe ahụ.