ASỤSỤ IGBO: ỌBA NCHEKWA OMENALA NA IHE NKETA NDỊ IGBO
Keywords:
Ndị Igbo, Omenala, Ihe nketa, Omenala ndị Igbo, Asụsụ, Asụsụ IgboAbstract
Nchọcha a bụ maka asụsụ Igbo dị ka ọba nchekwa omenala na ihe nketa ndị Igbo. O lebara anya n'etu asụsụ Igbo si bụrụ ebe nchekwa omenala na ihe nketa ndị Igbo. Ndị nchọcha gbasoro usoro nke a kpọrọ nkọwa sọvee wee mee nchọcha ha. Ebumnobi nchọcha a bụ ịchọpụta ọrụ asụsụ Igbo n'ịchekwa omenala na ihe nketa ndị Igbo. Atụtụ a gbasoro wee mee nchọcha a bụ atụtụ ike asụsụ agbụrụ (Ethnolinguistic vitality theory) nke Bourhis, Giles na Taylor tụpụtara n’afọ 1977, na atụtụ ngosipụta ọrụ (Structural functionalism theory) nke Emile Durkheim tụpụtara n’afọ 1893. Site na nchọcha e mere, a chọpụtara ihe ndị nwere ike ibute ofufu omenala na ihe nketa ndị Igbo, uru asụsụ Igbo bara n'ịchekwa omenala na ihe nketa ndị Igbo; chọpụtakwa ụzọ a ga-esi kwalite asụsụ Igbo na ndị ọ bụ ọrụ ha ichekwaba omenala na ihe nketa ndị Igbo nwere.