NSOGBU ỤMỤ AKWỤKWỌ SỊNỊỌ SEKỌNDỊRỊ NA-ENWE N'ỌMỤMỤ MKPỤRỤ ỤDAASỤSỤ IGBO

Authors

  • NDIDI J. OKEY-AGBO PhD; STANLEY A. ỌZỌR Author

Abstract

Nchọcha a lebara anya na nsogbu ụmụ akwụkwọ sịnịọ sekọndịrị afọ nke mbụ na-enwe n’ọmụmụ mkpụrụ ụdaasụsụ Igbo. Ihe kpalitere nchọcha a bụ ihe nhịahụ ụmụ akwụkwọ na-enwe mgbe ha na-amụ asụsụ Igbo ọkachasị mkpụrụ ụdaasụsụ. Mbunuche nchọcha a bụ ịchọpụta ihe na-eweta nhịahụ nye ụmụ akwụkwọ sekọndịrị n'ịmụ mkpụrụ ụdaasụsụ dịka mkpọpụta ụda, olundị na ndị abụghị ndị Igbo. Nchọcha a gbadoro ụkwụ na atụtụ adịm gara gara asụsụ. Atụtụ a na-eleba anya ka asụsụ si dịdebe gara gara. Usoro a gbasoro mee nchọcha bụ sọvee nkọwa. Njịatule e ji rụo ọrụ na nchọcha a sitere n'ajụjụ ọnụ a gbara ụfọdụ ndị nkụzi na ụmụ akwụkwọ sịnịọ sekọndịrị ndị nọ n’afọ nke mbụ ha na steeti Anambra. Nchọcha a chọpụtara ihe ndị na-eweta ihe nhịahụ nye ụmụ akwụkwọ ndị na-amụ mkpụrụ ụdaasụsụ dịka mkpọpụta ụda, olundị na ndị abụghị ndị Igbo. Ụfọdụ ụda ndị na-arịa ụmụ akwụkwọ ahụ n'ọmụmụ gụnyere: /ɤ/, /η/ na /ηw/. Nchọcha a tụnyere aro ka ndị nkuzi na ndị na-akwado kọrịkụlum buru nke a n’obi ma wepụta ụzọ kachaa mma iji hụ na e belatara nsogbu a maọbụ ihe nhịahụ ndị a na-adị mgbe ụmụ akwụkwọ sịnịọ sekọndịrị nke mbụ na amụ mkpụrụ ụdaasụsụ.

Downloads

Published

2026-05-25