ATỤTỤ MGBANWERỊTA MMEKỌRỊTA MMADỤ NA IBE YA N’ỊTỤCHA MMEKỌRỊTA NNE DI NA NWUNYE NWA N’ALA IGBO
Abstract
Mmekọrịta nne di na nwunye nwa dị nnukwu mkpa n’alụmalụ n’ala Igbo. Ọtụtụ oge, agamnihu ọ kacha nke ezinaụlọ ọhụrụ na-adabere n’ụdị mmekọrịta nke nne di na nwunye nwa a lụrụ ọhụrụ nwere. Oge ụfọdụ, a na-anụ ebe ụfọdụ ụmụagbọghọ na-ekwu na ha achọghị inwe nne di. Nke a bụ n’ihi ebighị n’udo n’etiti ọtụtụ ndị nne di na nwunye nwa ha. Ebumnaobi nchọcha a bụ iji atụtụ mmekọrịta mmadụ na ibe ya were chọpụta ma tụchaa ihe ndị na-ebute esemokwu n’etiti nne di na nwunye nwa, na ịmata ihe ndị nwere ike inye aka gbochie nsogbu na esemokwu n’etiti nne di na nwunye nwa. E ji atụtụ mgbanwerịta mmekọrịta mmadụ na ibe ya nke George Casper Homans wepụtara n’afọ 1958 were tụchaa nchọcha a. Atụtụ a na akọwa na omume mmadụ na-esite n’usoro mmekọrịta dị n’etiti ya na onye ọzọ. Ọ bụ nchọcha nkọwa nke a gbasoro usoro sọvee were mee site n’ịgba ọtụtụ ndị mmadụ gụnyere ụmụnwaanyị bụ ndị nne di na ndị bụ nwunye nwa ajụjụ ọnụ wee nweta ngwa nchọcha e jiri mee nchọcha. Ọ ga-abara ndị nne na nna, nwunye nwa ọ kachasị ndị na-akwado ịbanye alụmalụ uru n’ihi na ọ ga-agbaziri ha etu ha ga-esi na-ebi n’udo. A chọpụtara na mmadụ ịnabata ndịiche dị n’etiti akparamagwa ya na nke onye ọzọ tinyere ịdị na-enwere mmadụ ndidi na-enyere ụfọdụ nne di na nwunye nwa aka ibi n’udo. A tụrụ aro ka nne di na nwunye nwa na-ebi n’udo ma wepụ ihe ndị ahụ na-ebutere ha esemokwu iji kwalite ịkwụdosi ike nke ezinaụlọ ma wepụ egwu ụfọdụ ụmụagbghọ na-atụ maka inwe nne di.